Mbe uwa bidoro, mbeahu agwum akukwo agba ohuru abatabe na ala Igbo, ndi Igbo na eji ohere Ifode amuta ofodu ihe site na omenala ruo na omenelu. Dika bibulu si diri umu Chineke, Ifo dika bibulu ndi Igbo.
Akuko ifo bu ifo okenye na gwa umuazi na abali mgbe onwa n’acha. Mbe ha ga ebido, umuazi n’ile ga agbako okirikiri onye na gwa ha ifo. Ha ga e gee nti ofuma maka onye na agwa ha ifo ga aju ajuju.
Mgbe oga ebido, onye nae kwu ifo ga asi; Ifode…
Ha za De…
Osi; Onwere akuko m ga akorunu
Ha za; Koro anyi ka obi di anyi mma
Akuko Ifo na ko maka ihe nile basara etu esi ebi ndu. Akuko Ifo na ko kari maka umu anumanu na agwa ha. Mbe na wukari onye aghuho. Abukwala mbe nyere mmadu ibe gi. Agu bu anumanu siri ike karia umu anumanu nile. O ya ka ha na akpo Eze ohia. Ona elekwazi ohia nile, na gba mbo ihu na umu anumanu biri n’udo. Okuko bu onye arafo ya mere ndi Igbo ruo taa naeji ya achu aja.
Ifo na akuzi otutu ihe. Ona ekuzi agboghobia na okorobia obi umeala na agwaoma. Ona ekwuzi na anyauku adighi mma. Ona ekwuzikwa ndidi, ihunaya na idikanotu ebe ibegi no. Ona ado umuagboho na umuokorobia aka na nti basara olulu di na nwuye. Onakwazi a za ofodu ajuju umuaka ugba na ju basara uwa na omume ndi Igbo.
Akuko Ifo anaghi eji ilu egwu egwu. Dika Chinua Achebe si kuo, Ilu bu mmanu iri eji ata okwu. Ifo n'eji ilu ndi Igbo a ko akuko jikwazi ya naenye ndumodu. Ilu ndi Igbo na to uto na nti.
Udo diri gi dika isi gba mbo guo edemede’m. Dika ndi Igbo siri kwuo, Ogologo oku adighi na uka mbede. Ekwuchalam, mbe emecha, mga edekwa ihe ozo basara emume ndi Igbo.
Igbo Amaka!
Author
Join the discussion
You may sign in to comment.